Abụ Ọma 55:19
Psalms 55:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi, onye na-adịghị agbanwe, ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ, nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela
Psalms 55:19 in English
Psalms 55:19 · Berean Standard Bible
God will hear and humiliate them— the One enthroned for the ages— Selah because they do not change and they have no fear of God.
Context
17Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị,
ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya
ma ọ na-anụkwa olu m. 18Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,
site nʼagha niile e busoro m,
nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m. 19Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,
onye na-adịghị agbanwe,
ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ,
nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela 20Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,
ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ. 21Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ* ka bọta,
ma ibu agha juru ya obi;
okwu ya niile dị nro karịa mmanụ,
ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.