Abụ Ọma 55:20
Psalms 55:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya, ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.
Psalms 55:20 in English
Psalms 55:20 · Berean Standard Bible
My companion attacks his friends; he violates his covenant.
Context
18Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,
site nʼagha niile e busoro m,
nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m. 19Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,
onye na-adịghị agbanwe,
ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ,
nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela 20Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,
ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ. 21Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ* ka bọta,
ma ibu agha juru ya obi;
okwu ya niile dị nro karịa mmanụ,
ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha. 22Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,
ọ ga-agba gị ume;
ọ gaghị ekwe
ka ewezuga onye ezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.