Abụ Ọma 55:22
Psalms 55:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.
Psalms 55:22 in English
Psalms 55:22 · Berean Standard Bible
Cast your burden upon the LORD and He will sustain you; He will never let the righteous be shaken.
Context
20Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,
ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ. 21Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ* ka bọta,
ma ibu agha juru ya obi;
okwu ya niile dị nro karịa mmanụ,
ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha. 22Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,
ọ ga-agba gị ume;
ọ gaghị ekwe
ka ewezuga onye ezi omume. 23Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume
nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure;
ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ
agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha.
Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
55:21 Ya bụ, okwu ire ụtọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.