Abụ Ọma 44:4
Psalms 44:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.
Psalms 44:4 in English
Psalms 44:4 · Berean Standard Bible
You are my King, O God, who ordains victories for Jacob.
Context
2I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ,
ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi.
I gwepịara ndị ahụ
ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa. 3Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a,
ha emerighị site nʼike nke aka ha;
ọ bụ aka nri gị, aka gị,
na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya. 4Ị bụ eze m na Chineke m,
onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri. 5Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị,
ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị. 6Atụkwasịghị m obi m nʼụta m,
mma agha m anaghị enye m mmeri;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.