Native Bible

Psalms 44:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.

Psalms 44:4 in English

Psalms 44:4 · Berean Standard Bible

You are my King, O God, who ordains victories for Jacob.

Context

2I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa. 3Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya. 4Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri. 5Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị, ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị. 6Atụkwasịghị m obi m nʼụta m, mma agha m anaghị enye m mmeri;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.