Abụ Ọma 44:3
Psalms 44:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.
Psalms 44:3 in English
Psalms 44:3 · Berean Standard Bible
For it was not by their sword that they took the land; their arm did not bring them victory. It was by Your right hand, Your arm, and the light of Your face, because You favored them.
Context
1O Chineke, anyị anụla;
nna anyị ha agwakwala anyị
ihe ndị i mere nʼoge ha,
nʼoge gara aga. 2I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ,
ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi.
I gwepịara ndị ahụ
ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa. 3Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a,
ha emerighị site nʼike nke aka ha;
ọ bụ aka nri gị, aka gị,
na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya. 4Ị bụ eze m na Chineke m,
onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri. 5Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị,
ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.