Native Bible

Psalms 35:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.

Psalms 35:20 in English

Psalms 35:20 · Berean Standard Bible

For they do not speak peace, but they devise deceitful schemes against those who live quietly in the land.

Context

18Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị. 19Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike. 20Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ. 21Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.” 22O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.