Native Bible

Psalms 35:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”

Psalms 35:21 in English

Psalms 35:21 · Berean Standard Bible

They gape at me and say, “Aha, aha! Our eyes have seen!”

Context

19Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike. 20Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ. 21Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.” 22O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị. 23Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.