Abụ Ọma 35:18
Psalms 35:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.
Psalms 35:18 in English
Psalms 35:18 · Berean Standard Bible
Then I will give You thanks in the great assembly; I will praise You among many people.
Context
16Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe,
na-atakwara m ikikere eze ha. 17O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme?
Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile,
site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa. 18Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu,
nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị. 19Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m,
mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị;
ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro,
mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike. 20Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu,
kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche
megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.