Abụ Ọma 35:17
Psalms 35:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.
Psalms 35:17 in English
Psalms 35:17 · Berean Standard Bible
How long, O Lord, will You look on? Rescue my soul from their ravages, my precious life from these lions.
Context
15Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ;
mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m.
Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka. 16Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe,
na-atakwara m ikikere eze ha. 17O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme?
Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile,
site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa. 18Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu,
nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị. 19Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m,
mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị;
ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro,
mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.