Abụ Ọma 35:14
Psalms 35:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.
Psalms 35:14 in English
Psalms 35:14 · Berean Standard Bible
I paced about as for my friend or brother; I was bowed down with grief, like one mourning for his mother.
Context
12Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ.
Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ. 13Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe,
site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala.
Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa, 14ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ,
dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m,
jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị
na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ. 15Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ;
mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m.
Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka. 16Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe,
na-atakwara m ikikere eze ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.