Abụ Ọma 35:13
Psalms 35:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,
Psalms 35:13 in English
Psalms 35:13 · Berean Standard Bible
Yet when they were ill, I put on sackcloth; I humbled myself with fasting, but my prayers returned unanswered.*
Context
11Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m;
ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ. 12Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ.
Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ. 13Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe,
site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala.
Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa, 14ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ,
dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m,
jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị
na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ. 15Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ;
mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m.
Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.