Abụ Ọma 35:12
Psalms 35:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.
Psalms 35:12 in English
Psalms 35:12 · Berean Standard Bible
They repay me evil for good, to the bereavement of my soul.
Context
10Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị,
“O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị?
Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha,
ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.” 11Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m;
ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ. 12Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ.
Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ. 13Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe,
site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala.
Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa, 14ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ,
dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m,
jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị
na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.