Abụ Ọma 21:5
Psalms 21:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya.
Psalms 21:5 in English
Psalms 21:5 · Berean Standard Bible
Great is his glory in Your salvation; You bestow on him splendor and majesty.
Context
3I ji ngọzị bara ụba nabata ya,
ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi. 4Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya
mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya,
ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya. 6Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị. 7Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,
agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya
nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.