Abụ Ọma 21:3
Psalms 21:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi.
Psalms 21:3 in English
Psalms 21:3 · Berean Standard Bible
For You welcomed him with rich blessings; You placed on his head a crown of pure gold.
Context
1O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị.
Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya! 2I nyela ya ihe obi ya chọrọ;
i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! Sela 3I ji ngọzị bara ụba nabata ya,
ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi. 4Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya
mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya,
ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.