Abụ Ọma 21:4
Psalms 21:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Psalms 21:4 in English
Psalms 21:4 · Berean Standard Bible
He asked You for life, and You granted it— length of days, forever and ever.
Context
2I nyela ya ihe obi ya chọrọ;
i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! Sela 3I ji ngọzị bara ụba nabata ya,
ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi. 4Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya
mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya,
ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya. 6Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.