Abụ Ọma 21:6
Psalms 21:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.
Psalms 21:6 in English
Psalms 21:6 · Berean Standard Bible
For You grant him blessings forever; You cheer him with joy in Your presence.
Context
4Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya
mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya,
ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya. 6Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị. 7Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,
agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya
nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ. 8Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile;
aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.