Abụ Ọma 21:7
Psalms 21:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Psalms 21:7 in English
Psalms 21:7 · Berean Standard Bible
For the king trusts in the LORD; through the loving devotion of the Most High, he will not be shaken.
Context
5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya,
ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya. 6Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị. 7Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,
agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya
nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ. 8Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile;
aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị. 9Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ,
ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.
Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha,
ọkụ ya ga-erepịakwa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.