Abụ Ọma 21:9
Psalms 21:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.
Psalms 21:9 in English
Psalms 21:9 · Berean Standard Bible
You will place them in a fiery furnace at the time of Your appearing. In His wrath the LORD will engulf them, and the fire will consume them.
Context
7Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,
agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya
nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ. 8Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile;
aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị. 9Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ,
ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.
Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha,
ọkụ ya ga-erepịakwa ha. 10Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi,
ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ. 11Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị,
maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.