Native Bible

Psalms 21:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha.

Psalms 21:11 in English

Psalms 21:11 · Berean Standard Bible

Though they intend You harm, the schemes they devise will not prevail.

Context

9Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha. 10Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ. 11Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha. 12Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu. 13O Onyenwe anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị; anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.