Abụ Ọma 21:10
Psalms 21:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ.
Psalms 21:10 in English
Psalms 21:10 · Berean Standard Bible
You will wipe their descendants from the earth, and their offspring from the sons of men.
Context
8Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile;
aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị. 9Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ,
ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.
Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha,
ọkụ ya ga-erepịakwa ha. 10Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi,
ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ. 11Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị,
maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha. 12Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ
mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.