Native Bible

Psalms 18:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?

Psalms 18:31 in English

Psalms 18:31 · Berean Standard Bible

For who is God besides the LORD? And who is the Rock except our God?

Context

29Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 30Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta* nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 31Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? 32Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. 33Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.