Abụ Ọma 18:31
Psalms 18:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?
Psalms 18:31 in English
Psalms 18:31 · Berean Standard Bible
For who is God besides the LORD? And who is the Rock except our God?
Context
29Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,
sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 30Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,
okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha;
ọ bụ ọta* nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 31Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? 32Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. 33Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;
Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.