Native Bible

Psalms 18:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.

Psalms 18:32 in English

Psalms 18:32 · Berean Standard Bible

It is God who arms me with strength and makes my way clear.

Context

30Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta* nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 31Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? 32Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. 33Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. 34Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.