Native Bible

Psalms 18:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta* nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.

Psalms 18:30 in English

Psalms 18:30 · Berean Standard Bible

As for God, His way is perfect; the word of the LORD is flawless. He is a shield to all who take refuge in Him.

Context

28Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 29Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 30Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta* nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 31Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? 32Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.