Native Bible

Psalms 18:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.

Psalms 18:29 in English

Psalms 18:29 · Berean Standard Bible

For in You I can charge an army, and with my God I can scale a wall.

Context

27Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala. 28Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 29Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 30Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta* nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 31Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.