Abụ Ọma 18:27
Psalms 18:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.
Psalms 18:27 in English
Psalms 18:27 · Berean Standard Bible
For You save an afflicted people, but You humble those with haughty eyes.
Context
25Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. 26Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. 27Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala. 28Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu,
Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 29Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,
sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.