Abụ Ọma 18:26
Psalms 18:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
Psalms 18:26 in English
Psalms 18:26 · Berean Standard Bible
to the pure You show Yourself pure, but to the crooked You show Yourself shrewd.
Context
24Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya. 25Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. 26Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. 27Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala. 28Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu,
Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.