Abụ Ọma 17:9
Psalms 17:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.
Psalms 17:9 in English
Psalms 17:9 · Berean Standard Bible
from the wicked who assail me, from my mortal enemies who surround me.
Context
7Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube;
gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta
ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha. 8Chebe m dịka mkpụrụ anya gị;
zoo m na ndo nke nku gị, 9site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu,
ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m. 10Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri,
okwu ịnya isi juru ha ọnụ. 11Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu,
ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.