Native Bible

Psalms 17:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.

Psalms 17:7 in English

Psalms 17:7 · Berean Standard Bible

Show the wonders of Your loving devotion, You who save by Your right hand those who seek refuge from their foes.

Context

5Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya. 6Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m. 7Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha. 8Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị, 9site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.