Native Bible

Psalms 148:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,

Psalms 148:11 in English

Psalms 148:11 · Berean Standard Bible

kings of the earth and all peoples, princes and all rulers of the earth,

Context

9unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile 10na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile, 11ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa, 12ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị. 13Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.