Native Bible

Psalms 146:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta.

Psalms 146:3 in English

Psalms 146:3 · Berean Standard Bible

Put not your trust in princes, in mortal man, who cannot save.

Context

1Toonu Onyenwe anyị. O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. 2Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ. 3Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta. 4Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja*; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu. 5Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.