Abụ Ọma 146:5
Psalms 146:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya.
Psalms 146:5 in English
Psalms 146:5 · Berean Standard Bible
Blessed is he whose help is the God of Jacob, whose hope is in the LORD his God,
Context
3Atụkwasịla ụmụ eze obi gị,
ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta. 4Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja*;
nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu. 5Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb,
onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya. 6Onye kere eluigwe na ụwa,
na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha,
Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 7Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu
na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri.
Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.