Native Bible

Psalms 146:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja*; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.

Psalms 146:4 in English

Psalms 146:4 · Berean Standard Bible

When his spirit departs, he returns to the ground; on that very day his plans perish.

Context

2Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ. 3Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta. 4Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja*; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu. 5Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya. 6Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.