Abụ Ọma 146:6
Psalms 146:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Psalms 146:6 in English
Psalms 146:6 · Berean Standard Bible
the Maker of heaven and earth, the sea, and everything in them. He remains faithful forever.
Context
4Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja*;
nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu. 5Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb,
onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya. 6Onye kere eluigwe na ụwa,
na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha,
Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 7Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu
na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri.
Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 8Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba,
Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.