Abụ Ọma 146:8
Psalms 146:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.
Psalms 146:8 in English
Psalms 146:8 · Berean Standard Bible
the LORD opens the eyes of the blind, the LORD lifts those who are weighed down, the LORD loves the righteous.
Context
6Onye kere eluigwe na ụwa,
na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha,
Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 7Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu
na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri.
Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 8Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba,
Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. 9Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa,
na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ,
ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. 10Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi,
Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Toonu Onyenwe anyị.
146:4 Ekl 12:7
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.