Native Bible

Psalms 139:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.

Psalms 139:18 in English

Psalms 139:18 · Berean Standard Bible

If I were to count them, they would outnumber the grains of sand; and when I awake, I am still with You.

Context

16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị. 17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu. 18Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ. 19O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara! 20Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.