Native Bible

Psalms 139:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.

Psalms 139:16 in English

Psalms 139:16 · Berean Standard Bible

Your eyes saw my unformed body; all my days were written in Your book and ordained for me before one of them came to be.

Context

14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma. 15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa. 16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị. 17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu. 18Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.