Abụ Ọma 139:14
Psalms 139:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.
Psalms 139:14 in English
Psalms 139:14 · Berean Standard Bible
I praise You, for I am fearfully and wonderfully made. Marvelous are Your works, and I know this very well.
Context
12Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ;
abalị ga-enye ìhè dịka ehihie,
nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.* 13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. 14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
ọrụ gị niile dị ebube;
amaara m nke a nke ọma. 15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ
mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,
mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa. 16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.
E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị
tupu otu nʼime ha adịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.