Native Bible

Psalms 139:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

Psalms 139:15 in English

Psalms 139:15 · Berean Standard Bible

My frame was not hidden from You when I was made in secret, when I was woven together in the depths of the earth.

Context

13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. 14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma. 15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa. 16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị. 17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.