Native Bible

Psalms 118:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.

Psalms 118:17 in English

Psalms 118:17 · Berean Standard Bible

I will not die, but I will live and proclaim what the LORD has done.

Context

15Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu! 16Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!” 17Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ. 18Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ. 19Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.