Native Bible

Psalms 118:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.

Psalms 118:19 in English

Psalms 118:19 · Berean Standard Bible

Open to me the gates of righteousness, that I may enter and give thanks to the LORD.

Context

17Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ. 18Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ. 19Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele. 20Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye. 21Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.