Abụ Ọma 107:31
Psalms 107:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
Psalms 107:31 in English
Psalms 107:31 · Berean Standard Bible
Let them give thanks to the LORD for His loving devotion and His wonders to the sons of men.
Context
29O mere ka oke ifufe dere duu;
o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ. 30Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ,
o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo. 31Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ. 32Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ
ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye. 33Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara;
na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.