Native Bible

Psalms 106:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.

Psalms 106:34 in English

Psalms 106:34 · Berean Standard Bible

They did not destroy the peoples as the LORD had commanded them,

Context

32Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis; 33nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu. 34Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee. 35Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme. 36Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.