Native Bible

Psalms 105:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.

Psalms 105:20 in English

Psalms 105:20 · Berean Standard Bible

The king sent and released him; the ruler of peoples set him free.

Context

18Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu, 19tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu. 20Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya. 21O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere, 22ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.