Native Bible

Psalms 104:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma.

Psalms 104:28 in English

Psalms 104:28 · Berean Standard Bible

When You give it to them, they gather it up; when You open Your hand, they are satisfied with good things.

Context

26Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu. 27Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru. 28Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma. 29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta. 30Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.