Native Bible

Psalms 104:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.

Psalms 104:27 in English

Psalms 104:27 · Berean Standard Bible

All creatures look to You to give them their food in due season.

Context

25Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta. 26Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu. 27Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru. 28Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma. 29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.