Abụ Ọma 104:27
Psalms 104:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.
Psalms 104:27 in English
Psalms 104:27 · Berean Standard Bible
All creatures look to You to give them their food in due season.
Context
25Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara;
jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi,
anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta. 26Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị,
nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu. 27Ha niile na-adabere na gị,
ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru. 28Ị na-enye ha nri;
ha na-erikwa ya.
Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri,
afọ na-eju ha nke ọma. 29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,
egwu na-eju ha obi.
Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha,
ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.