Abụ Ọma 104:29
Psalms 104:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.
Psalms 104:29 in English
Psalms 104:29 · Berean Standard Bible
When You hide Your face, they are terrified; when You take away their breath, they die and return to dust.
Context
27Ha niile na-adabere na gị,
ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru. 28Ị na-enye ha nri;
ha na-erikwa ya.
Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri,
afọ na-eju ha nke ọma. 29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,
egwu na-eju ha obi.
Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha,
ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta. 30Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,
a na-eke ha;
ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa. 31Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;
ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.