Abụ Ọma 104:30
Psalms 104:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.
Psalms 104:30 in English
Psalms 104:30 · Berean Standard Bible
When You send Your Spirit,* they are created, and You renew the face of the earth.
Context
28Ị na-enye ha nri;
ha na-erikwa ya.
Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri,
afọ na-eju ha nke ọma. 29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,
egwu na-eju ha obi.
Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha,
ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta. 30Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,
a na-eke ha;
ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa. 31Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;
ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ, 32onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji,
onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.