Native Bible

Psalms 104:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.

Psalms 104:30 in English

Psalms 104:30 · Berean Standard Bible

When You send Your Spirit,* they are created, and You renew the face of the earth.

Context

28Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma. 29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta. 30Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa. 31Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ, 32onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji, onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.