Native Bible

Proverbs 8:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike.

Proverbs 8:14 in English

Proverbs 8:14 · Berean Standard Bible

Counsel and sound judgment are mine; I have insight and strength.

Context

12“Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu. 13Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị. 14Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike. 15Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi. 16Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.