Ilu 8:13
Proverbs 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
Proverbs 8:13 in English
Proverbs 8:13 · Berean Standard Bible
To fear the LORD is to hate evil; I hate arrogant pride, evil conduct, and perverse speech.
Context
11Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa.
Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya. 12“Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta.
Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu. 13Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.
Akpọrọ m nganga na mpako,
omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị. 14Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m;
enwekwara m ọmụma ihe na ike. 15Site na m ka ndị eze ji achị,
ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.