Ilu 7:21
Proverbs 7:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.
Proverbs 7:21 in English
Proverbs 7:21 · Berean Standard Bible
With her great persuasion she entices him; with her flattering lips she lures him.
Context
19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ
o jeela njem dị anya. 20O ji akpa ego juru gaa njem,
abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.” 21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya.
O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ. 22O sooro nwanyị ahụ dịka ehi
a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya,
dịka ele* nke na-aba nʼọnya, 23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi.
Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya
na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.